7 m ga-ebipụkwa Izrel n’elu ala ahụ m nyere ha;+ m ga-esikwa n’ihu m tụfuo ụlọ ahụ nke m doro nsọ nye aha m,+ Izrel ga-aghọkwa ihe e ji atụ ilu+ na ihe ịkwa emo n’etiti ndị niile.
16 ka ha wee mee ka ala ha bụrụ ihe ijuanya,+ nke a ga na-afụrụ mkpọrọhịhị ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Onye ọ bụla nke na-agafere ya ga-ekporopụ anya na-ele ya, fufeekwa n’isi.+