12 O wee sị: “N’ihi na m ga-anọnyere gị,+ nke a ga-abụkwara gị ihe ịrịba ama na ọ bụ m zigara gị:+ Mgbe ị kpọpụtasịrị ndị m n’Ijipt, unu ga-ejere ezi Chineke ozi n’ugwu a.”+
6 Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Atụla egwu, amakwala jijiji n’ihu ha,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka gị na ya so na-aga. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.”+
5 Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu gị ụbọchị niile nke ndụ gị.+ M ga-anọnyere gị dị nnọọ ka m nọnyeere Mozis.+ Agaghị m agbahapụ gị, agaghịkwa m ahapụ gị ma ọlị.+
20 “Emewo m ka ị ghọọrọ ndị a mgbidi ọla kọpa e wusiri ike;+ ha ga-alụso gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị.+ N’ihi na m nọnyeere gị, ịzọpụta gị na ịnapụta gị,”+ ka Jehova kwuru.