44 Ma n’agbanyeghị ihe a dum, mgbe ha nọ n’ala ndị iro ha, agaghị m ajụ ha,+ agaghịkwa m akpọ ha asị+ wee kpochapụ ha, mebie ọgbụgba ndụ+ mụ na ha; n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha.
8 “‘Lee! Anya Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ele alaeze nke na-eme mmehie.+ Ọ ga-ekpochapụkwa ya n’elu ala.+ Ka o sina dị, m gaghị ekpochapụ ụlọ Jekọb kpamkpam,’+ ka Jehova kwuru.