19 gị onwe gị, n’ihi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị+ ha n’ala ịkpa. Ogidi ígwé ojii nke na-edu ha n’ụzọ esighịkwa n’ebe ha nọ pụọ n’ehihie,+ ogidi ọkụ ahapụghịkwa ha n’abalị inye ha ìhè n’ụzọ ha kwesịrị iso.+
11 “N’ihi na m nọnyeere gị,” ka Jehova kwuru, “ịzọpụta gị;+ ma m ga-ekpochapụ mba niile m chụgara gị.+ Otú ọ dị, agaghị m ekpochapụ gị.+ M ga-agbazi gị ruo n’ókè kwesịrị ekwesị, n’ihi na agaghị m ahapụ inye gị ntaramahụhụ.”+