8 Ha wee bịakwute Gedalaya n’obodo Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ Ishmel+ nwa Netanaya na Johenan+ na Jọnatan, bụ́ ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet na ụmụ Ifaị onye Netofa+ na Jezanaya+ nwa onye Meakat,+ ha na ndị agha ha.+
2 Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom iri ahụ ya na ha so wee bilie jiri mma agha gbuo Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan.+ O wee gbuo onye eze Babịlọn mere onyeisi ala.+