23 Mgbe ndị isi niile nke ndị agha,+ ha na ndị agha ha, nụrụ na eze Babịlọn họpụtara Gedalaya, ha bịakwutere Gedalaya n’obodo Mizpa+ ozugbo ahụ, ya bụ, Ishmel nwa Netanaya na Johenan nwa Kariya na Seraya nwa Tanhumet onye Netofa na Jeazanaya nwa onye Meakat, ha na ndị agha ha.