8 Mkpi ahụ wee bulie onwe ya elu+ gabiga ókè: ma ozugbo ọ dịrị ike, a gbajiri nnukwu mpi ya, mpi anọ a na-ahụ nke ọma wee pulite n’isi ya wee nọchie ya, chee ihu n’ifufe anọ nke eluigwe.+
4 Mgbe o bilisịrị,+ a ga-agbaji alaeze ya ma kesaa ya nye ifufe anọ+ nke eluigwe,+ ma ọ bụghị ụmụ ya ka a ga-enye ya,+ ha agaghịkwa eji ụdị ike ahụ o ji chịa na-achị; n’ihi na a ga-efopụ alaeze ya, were ya nye ndị ọzọ na-abụghị ndị a.
7Mgbe nke a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi+ anọ ndị guzo na nkuku anọ nke ụwa, ha jidesiri ifufe anọ+ nke ụwa ike, ka ifufe ọ bụla wee ghara ifekwasị ụwa ma ọ bụ oké osimiri ma ọ bụ osisi ọ bụla.+