12 Unu ụlọ Devid,+ nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kpeenụ ikpe ziri ezi+ kwa ụtụtụ,+ napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya,+ ka ọnụma m ghara inwuru dị ka ọkụ+ wee ree unu, n’enweghị onye ga-emenyụ ya n’ihi omume ọjọọ unu.”’+
3 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume, napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya; unu emegbula onye mbịarambịa ọ bụla, nwa na-enweghị nna ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ.+ Unu emesola ha ihe ike.+ Unu awụfukwala ọbara ọ bụla na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe a.+