5Gaanụ jegharịa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem ka unu lee, mata, chọọkwa n’ámá ya dị iche iche ma ọ̀ dị onye unu pụrụ ịhụ,+ ma è nwere onye na-eme ihe ziri ezi,+ onye ọ bụla nke na-achọ ikwesị ntụkwasị obi,+ m ga-agbagharakwa obodo a.
4Ụmụ Izrel, nụrụnụ okwu Jehova, n’ihi na Jehova nwere okwu ikpe megide ndị bi n’ala a,+ n’ihi na eziokwu+ na obiọma* na ihe ọmụma banyere Chineke adịghị n’ala a.+
2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+