10 O wee mee ka a ghakwara ịnọ na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu ụmụ Hinọm,+ na-efe ofufe, ka onye ọ bụla ghara isurere* Molek+ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ.+
6 O surekwara* ụmụ ya n’ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm.+ O mekwara anwansi,+ gbaa afa+ ma mee mgbaasị,+ o mekwara ka e nwee ndị na-eme mgbaasị+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu.+ O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.+
6 “‘“Ya mere, lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe a na-agakwaghị akpọ ebe a Tofet+ nakwa ndagwurugwu nwa Hinọm,+ kama, a ga na-akpọ ya ndagwurugwu igbu mmadụ.