33 N’ihi na e doworị Tofet+ ya n’usoro n’oge na-adịbeghị anya; a kwadebewokwara ya eze.+ Ọ kwakọtawo nkụ ya n’ebe miri emi. E nwere ọkụ na nkụ dị ukwuu. Ume Jehova na-ere ka ọkụ megide ya, dị ka sọlfọ nke na-asọ ka mmiri.+
31 Ha ewuwo ebe ndị dị elu na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ iji suree ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ,+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu, ọ bataghịkwa m n’obi.’+
6 “‘“Ya mere, lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe a na-agakwaghị akpọ ebe a Tofet+ nakwa ndagwurugwu nwa Hinọm,+ kama, a ga na-akpọ ya ndagwurugwu igbu mmadụ.
11 Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Dị ka mmadụ si akụwa ite ọkpụite kpụrụ nke na a pụghị imezi ya emezi, otú ahụ ka m ga-esi kụọ ndị a na obodo a righirighi;+ a ga-elikwa ha na Tofet+ ruo mgbe a na-agakwaghị enwe ebe a ga-eli ha.”’+