28 Ị̀ matabeghị, ka ọ̀ bụ na ị nụbeghị?+ Jehova, bụ́ Onye kere nsọtụ niile nke ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọ naghị ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.+ Nghọta ya enweghị nchọpụta.+
15 sị: “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị onwe anyị kwa bụ mmadụ+ ndị nwere otu ụdị adịghị ike ndị unu nwere,+ anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu wee hapụ ihe efu+ ndị a ma bịakwute Chineke ahụ dị ndụ,+ onye kere eluigwe+ na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha.
11 “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto+ na nsọpụrụ+ na ike,+ n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile,+ ọ bụkwa n’ihi uche gị+ ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”+