Jeremaya 9:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 A sị nnọọ na isi m bụ mmiri, anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri!+ M gaara akwara ndị e gburu egbu n’etiti ada bụ́ ndị m ákwá ehihie na abalị.+ Abụ Ákwá 1:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ọ na-akwagbu onwe ya n’ákwá n’abalị,+ anya mmiri na-asọda ya na ntì.+Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị niile hụrụ ya n’anya nke na-akasi ya obi.+Ndị enyi ya niile aghọgbuwo ya.+ Ha aghọwo ndị iro ya.+ Abụ Ákwá 2:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Obi ha etikuwo Jehova,+ gị mgbidi nke ada bụ́ Zayọn.+Mee ka anya mmiri na-asọ dị ka iyi, ehihie na abalị.+Emela ka ahụ́ sie gị. Ka nwa anya gị ghara ịkwụsị ịgbapụta anya mmiri.
9 A sị nnọọ na isi m bụ mmiri, anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri!+ M gaara akwara ndị e gburu egbu n’etiti ada bụ́ ndị m ákwá ehihie na abalị.+
2 Ọ na-akwagbu onwe ya n’ákwá n’abalị,+ anya mmiri na-asọda ya na ntì.+Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị niile hụrụ ya n’anya nke na-akasi ya obi.+Ndị enyi ya niile aghọgbuwo ya.+ Ha aghọwo ndị iro ya.+
18 Obi ha etikuwo Jehova,+ gị mgbidi nke ada bụ́ Zayọn.+Mee ka anya mmiri na-asọ dị ka iyi, ehihie na abalị.+Emela ka ahụ́ sie gị. Ka nwa anya gị ghara ịkwụsị ịgbapụta anya mmiri.