9A sị nnọọ na isi m bụ mmiri, anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri!+ M gaara akwara ndị e gburu egbu n’etiti ada bụ́ ndị m ákwá ehihie na abalị.+
17 Ọ bụrụ na unu anụghị ya,+ mkpụrụ obi m ga-ebe ákwá n’ebe zoro ezo n’ihi nganga unu, bepụtakwa anya mmiri; anya mmiri ga-esikwa m n’anya na-asọdata,+ n’ihi na a dọrọwo ìgwè atụrụ+ Jehova n’agha.
17 “Gwa ha, sị: ‘Ka anya mmiri na-agbapụta m n’anya n’akwụsịghị akwụsị abalị na ehihie,+ n’ihi na ada na-amaghị nwoke bụ́ ndị m adawo ajọ ọdịda wee gbajie ọkpụkpụ,+ ahụ́ o merụrụ dị oké njọ.+