4 Ọ bụ ya mere m ji sị: “Kwụsịnụ ile m anya. M ga-eji obi ilu kwaa ákwá.+ Unu esila ọnwụ na unu ga-akasi m obi n’ihi mbukọrọ e bukọọrọ ihe ada bụ́ ndị m.+
17 Ọ bụrụ na unu anụghị ya,+ mkpụrụ obi m ga-ebe ákwá n’ebe zoro ezo n’ihi nganga unu, bepụtakwa anya mmiri; anya mmiri ga-esikwa m n’anya na-asọdata,+ n’ihi na a dọrọwo ìgwè atụrụ+ Jehova n’agha.