19 Eriri afọ m, eriri afọ m! Obi na-egbusi m mgbu ike.+ Obi m na-agba ghara ghara.+ Apụghị m ịgbachi nkịtị, n’ihi na mkpụrụ obi m anụwo ụda opi, ya bụ, opi agha.+
26 Ada bụ́ ndị m, kee ákwà iru uju n’úkwù,+ tụrụọkwa onwe gị ná ntụ.+ Ruo uju dị ka nke a na-eruru nwa a mụrụ naanị ya ma ọ nwụọ, bụ́ mkpu arịrị e ji obi ilu na-eti;+ n’ihi na onye na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-abịakwasị anyị na mberede.+
9A sị nnọọ na isi m bụ mmiri, anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri!+ M gaara akwara ndị e gburu egbu n’etiti ada bụ́ ndị m ákwá ehihie na abalị.+
8 N’ihi nke a, m ga-akwa ákwá arịrị, tiekwa mkpu ákwá;+ m ga-agba ụkwụ efu, gbarakwa ọtọ na-ejegharị.+ M ga na-eti mkpu dị ka nkịta ọhịa, na-erukwa uju dị ka nne enyí nnụnụ.