14 “Kọọnụ ya n’Ijipt, kwusaanụ ya na Migdọl,+ kwusaakwanụ ya na Nọf+ nakwa na Tapanhis.+ Sịnụ, ‘Guzoro, jikere,+ n’ihi na mma agha ga-eripịa gị gburugburu.+
18 Ụbọchị ga-agba ọchịchịrị na Tihafnihis,+ mgbe m ga-agbaji osisi yok Ijipt+ n’ebe ahụ. N’ime ya ka a ga-ebibi ike ya nke na-ebu ya isi.+ Ígwé ojii ga-ekpuchi ya,+ a ga-adọrọkwa obodo nta ya niile n’agha.+