64 “Jehova ga-achụsasị gị n’etiti ndị niile malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa,+ n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị ị na-amaghị, ndị gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị, bụ́ osisi na nkume.+
9 m ga-emekwa ka ha ghọọ ihe na-akpata ịma jijiji na ndị ọdachi ga-adakwasị n’alaeze niile nke ụwa,+ meekwa ka ha ghọọ ihe nkọcha na ihe e ji atụ ilu na ihe ịkwa emo+ na ihe a bụrụ ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụsasị ha.+