36 Jehova ga-eme ka gị+ na eze+ gị nke ị ga-eme ka ọ chịwa gị gaa ná mba ị na-amaghị, bụ́ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị; n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị e ji osisi na nkume mee.+
15 Otú a ka o si dọrọ Jehoyakin+ n’agha laa Babịlọn;+ o wee si na Jeruselem kpụrụ nne eze+ na ndị nwunye eze na ndị na-eje ozi n’obí ya+ na ndị isi ala ahụ ka ha bụrụ ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn.
13 M ga-agbasakwa ụgbụ m n’elu ya, m ga-eji ụgbụ m ji achụ nta jide ya;+ m ga-adọrọ ya bịa Babịlọn, n’ala ndị Kaldia,+ ma ọ gaghị ahụ ala ahụ; n’ebe ahụkwa ka ọ ga-anwụ.+