5 Ndị agha ndị Kaldia wee chụwa ha,+ ha wee chụkwute Zedekaya na mbara ọzara Jeriko.+ Ha wee kpụrụ ya bịakwute Nebukadreza eze Babịlọn n’ime Ribla,+ n’ala Hemat,+ ka o kpee ya ikpe.+
13 M ga-agbasakwa ụgbụ m n’elu ya, m ga-eji ụgbụ m ji achụ nta jide ya;+ m ga-adọrọ ya bịa Babịlọn, n’ala ndị Kaldia,+ ma ọ gaghị ahụ ala ahụ; n’ebe ahụkwa ka ọ ga-anwụ.+