27 Kama Jehova sịrị: “M ga-ewepụkwa Juda+ n’ihu m,+ dị nnọọ ka m wepụrụ Izrel;+ m ga-ajụkwa obodo a nke m họọrọ, ya bụ, Jeruselem, nakwa ụlọ ahụ nke m kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adịgide na ya.’”+
10 Onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ,+ onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.+ Onye na-asị, ‘Ihe m kpebiri ga-adịgide,+ ọ bụkwa ihe niile dị m ụtọ ka m ga-eme’;+
11 otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị.+ Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m,+ kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ,+ ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.+