Aịzaya 1:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+ Ezikiel 19:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 “Ma gị onwe gị, bụọ abụ iru uju+ banyere ndị isi Izrel,+ Maịka 3:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 M wee sị: “Biko, nụrụnụ, unu ndị isi Jekọb na unu ndị ọchịagha nke ụlọ Izrel.+ Ọ́ bụghị unu ka ọ dịịrị ịmara ihe bụ́ ikpe ziri ezi?+ Zefanaya 3:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ndị isi nọ n’ime ya bụ ọdụm na-ebigbọ ebigbọ.+ Ndị na-ekpe ikpe na ya bụ anụ ọhịa wolf mgbede ndị na-adịghị atafọ ọkpụkpụ ọ bụla ruo ụtụtụ.+
23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+
3 M wee sị: “Biko, nụrụnụ, unu ndị isi Jekọb na unu ndị ọchịagha nke ụlọ Izrel.+ Ọ́ bụghị unu ka ọ dịịrị ịmara ihe bụ́ ikpe ziri ezi?+
3 Ndị isi nọ n’ime ya bụ ọdụm na-ebigbọ ebigbọ.+ Ndị na-ekpe ikpe na ya bụ anụ ọhịa wolf mgbede ndị na-adịghị atafọ ọkpụkpụ ọ bụla ruo ụtụtụ.+