14 E mesịa, Aịzaya onye amụma bịakwutere Eze Hezekaya wee sị ya:+ “Gịnị ka ndị ikom a kwuru, ebeekwa ka ha si bịakwute gị?”+ Hezekaya wee sị: “Ha si n’ala dị anya bịa, ha si Babịlọn.”
3 E mesịa, Aịzaya onye amụma bịakwutere Eze Hezekaya wee sị ya:+ “Gịnị ka ndị ikom a kwuru, oleekwa ebe ha si bịakwute gị?” Hezekaya wee sị: “Ha si n’ala dị anya bịakwute m, ha si Babịlọn.”+
19 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, meere onwe gị ụzọ abụọ mma agha eze Babịlọn ga-esi bata.+ Ha abụọ ga-esi n’otu ala ahụ pụta, a ga-emekwa ka e nwee ihe ga na-egosi ụzọ;+ a ga-eme ka ọ dịrị n’isi ụzọ e si abanye n’obodo.