39 M ga-enyefekwa gị n’aka ha, ha ga-akwatu ebe dị mkputamkpu ị rụrụ,+ kwadakwa ebe ndị dị elu gị,+ ha ga-eyipụ gị uwe gị,+ chịrị ihe ịchọ mma gị niile mara mma,+ yipụsịa gị uwe i yi, gbaa gị ọtọ.
3 ka m ghara ịgba ya ọtọ+ wee mee ka ọ dịrị otú ọ dị n’ụbọchị a mụrụ ya,+ meekwa ka ọ dị ka ala ịkpa,+ meekwa ka ọ dị ka ala mmiri na-adịghị,+ meekwa ka agụụ mmiri gụgbuo ya.+
16 Mpi iri+ ahụ na anụ ọhịa+ ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna+ ahụ asị, laakwa ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.+