17 “‘“Obi gị wee dị mpako n’ihi ịma mma gị.+ I mere ka amamihe gị laa n’iyi n’ihi mma ị mara nke na-egbu maramara.+ M ga-atụda gị n’ala.+ M ga-edebe gị n’ihu ndị eze, ka ha na-ele gị anya.+
10 M ga-emekwa ka ị bụrụ ihe ga-eme ka egwu jide ọtụtụ ndị.+ Ndị eze ha ga-amakwa jijiji n’egwu n’ihi gị mgbe m ga-efegharị mma agha m n’ihu ha,+ ha ga-amakwa jijiji n’oge ọ bụla, onye ọ bụla maka mkpụrụ obi ya, n’ụbọchị ị ga-ada.’+
9 “Ndị eze+ ụwa, ndị ha na ya kwara iko, biekwa ndụ okomoko n’emeghị ihere, ga-akwara ya ákwá, tiekwa aka n’obi wee ruoro ya uju,+ mgbe ha ga na-ele anwụrụ ọkụ+ nke si n’ọkụ a na-akpọ ya,