26 Mgbe m gbajiri mkpara unu ji ekonye achịcha,+ ndị inyom iri ga na-emere unu achịcha n’otu ekwú ma na-atụ achịcha ha na-enye unu atụ̀;+ unu ga-eri ihe ma afọ agaghị eju unu.+
3N’ihi na, lee! ezi Onyenwe anyị,+ bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-anapụ Jeruselem+ na Juda ihe na-akwado ha na ihe ha dabeere na ya, bụ́ nri na mmiri,+
16 “‘Mgbe m ga-ezipụ ajọ akụ́ bụ́ ụnwụ ka ọ bịakwasị unu,+ nke ga-abụ maka mbibi, ya bụ, akụ́ m ga-ezipụ ka o bibie unu,+ m ga-emekwa ka ụnwụ dị ukwuu n’ala unu, m ga-agbajisị mkpara unu ji ekonye achịcha.+