9 Ahụrụ m Jehova ka ọ nọ n’elu ebe ịchụàjà,+ o wee sị: “Tie ihe n’isi ogidi, ka ụzọ mbata niile wee mee mkpatụ. Gbujipụ isi ha, ha niile.+ M ga-ejikwa mma agha gbuo ndị fọdụrụ n’ime ha. Ọ dịghị onye n’ime ha na-agbapụ agbapụ nke pụrụ ịgbala. Ọ dịghịkwa onye n’ime ha na-agba ọsọ nke ga-alanahụ.+