18 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke na-agbanahụ ụda nke ihe ọ na-atụ ụjọ ya ga-adaba n’olulu, onye ọ bụla nke sikwa n’olulu na-arịgota, ọnyà ga-ama ya.+ N’ihi na a ga-emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke dị n’elu,+ ntọala niile nke ala a ga-amakwa jijiji.+
16 Unu wee sị: “Ee e, kama nke ahụ, anyị ga-anọkwasị n’elu ịnyịnya gbaa ọsọ!”+ Ọ bụ ya mere unu ga-eji gbaa ọsọ. “Anyị ga-agba ịnyịnya na-efe ọsọ!”+ Ọ bụ ya mere ndị na-achụ unu ga-eji na-efe ọsọ.+
14 Onye nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwe ebe ọ ga-agbaba.+ Ọ dịghị onye dị ike nke ga-eme onwe ya ka ọ dịkwuo ike, ọ dịghịkwa dike nke ga-emere mkpụrụ obi ya ụzọ mgbapụ.+