33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
64 “Jehova ga-achụsasị gị n’etiti ndị niile malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa,+ n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị ị na-amaghị, ndị gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị, bụ́ osisi na nkume.+
8 “Biko, cheta+ okwu i nyere Mozis ohu gị n’iwu, sị, ‘Ọ bụrụ na unu onwe unu emee omume ekwesịghị ntụkwasị obi, mụ onwe m kwa ga-achụsasị unu n’etiti ndị dị iche iche.+
21 A ga-eji mma agha gbuo ndị niile gbatara ọsọ ndụ n’ime ìgwè ndị agha ya, a ga-achụsasịkwa ndị fọdụrụnụ ebe niile.*+ Unu ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.”’+