15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu+ ma ọ bụ si otú a rafuo unu,+ unu atụkwasịkwala ya obi, n’ihi na ọ dịghị chi mba ọ bụla ma ọ bụ chi alaeze ọ bụla nwere ike ịnapụta ndị ya n’aka m nakwa n’aka nna nna m hà, ma ya fọdụzie Chineke unu ịnapụta unu n’aka m!’”+
36 “Eze ahụ ga-emekwa uche ya, ọ ga-ebulikwa onwe ya elu, meekwa onwe ya ka ọ dị elu karịa chi ọ bụla;+ ọ ga-ekwukwa ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ megide Chi kasị chi niile.+ Ihe ga-agakwara ya nke ọma ruo mgbe amamikpe ahụ kwụsịrị;+ n’ihi na a ga-eme ihe ahụ e kpebiri.