40 “Ị ga-emere ụmụ ndị ikom Erọn uwe mwụda,+ ị ga-emekwara ha ákwà a na-eke n’úkwù, ị ga-emekwara ha ákwà a na-afụ n’isi+ iji mee ka ha nwee ùgwù nakwa iji chọọ ha mma.+
19 Mgbe ha chọrọ ịga n’ogige dị ná mpụta, bụ́ ogige dị ná mpụta ebe ndị ọzọ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha na-eyi eje ozi,+ ha ga-edebekwa ha n’ụlọ dị nsọ ndị a na-anọ eri ihe+ ma yiri uwe ọzọ, ka ha ghara iji uwe ha doo ndị mmadụ nsọ.+