6 Ma a ga-akpọ unu ndị nchụàjà Jehova;+ a ga-asịkwa na unu bụ+ ndị ozi+ nke Chineke anyị. Unu ga-eri akụ̀ nke mba dị iche iche.+ Unu ga-eji aṅụrị na-ekwu okwu banyere onwe unu n’ihi ebube ha.+
18 Ọ dịghịkwa mgbe a na-agaghị enwe nwoke bụ́ otu n’ime ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, nke na-eguzo n’ihu m isure àjà a na-esurecha n’ọkụ na ịchụ àjà ọka* na ịchụ àjà nkịtị mgbe niile.’”+
5 unu onwe unu kwa, dị ka nkume dị ndụ, bụ ndị a na-ewu ka unu bụrụ ụlọ ime mmụọ,+ ka unu wee bụrụ òtù ndị nchụàjà dị nsọ, ka unu wee site n’aka Jizọs Kraịst na-achụ àjà ime mmụọ+ ndị Chineke na-anabata.+