25 M ga-awụsa gị iwe m,+ ha ga-ejikwa ọnụma mee gị ihe.+ Ha ga-ebepụ gị imi na ntị. A ga-ejikwa mma agha gbuo ndị gị fọrọ afọ. Ha ga-akpọrọ+ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom.+ Ọkụ ga-erepịakwa ndị gị fọrọ afọ.+
2 Jehova bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,+ bụrụkwa onye na-abọ ọbọ; Jehova na-abọ ọbọ,+ na-ewekwa iwe.+ Jehova ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro+ ya, ọ na-eweso ndị iro+ ya iwe.
17 M ga-ewetara ụmụ mmadụ oké nsogbu, ha ga-ejegharịkwa dị ka ndị ìsì;+ n’ihi na ọ bụ Jehova ka ha mehieworo.+ A ga-awụpụkwa ọbara ha dị ka ájá,+ wụpụkwa eriri afọ ha dị ka nsị.+