17 Ma ezi Chineke mere ka ụmụaka a, ha anọ, nwee ọgụgụ isi na nghọta n’ihe banyere edemede na amamihe+ niile; Daniel n’onwe ya na-aghọta ụdị ọhụụ ọ bụla na nrọ ọ bụla.+
28 Otú ọ dị, e nwere Chi nọ n’eluigwe, Onye na-ekpughe ihe nzuzo,+ o mewokwa ka Eze Nebukadneza mara ihe gaje ime n’oge ikpeazụ.+ Nke a bụ nrọ ị rọrọ na ọhụụ ị hụrụ mgbe i dina n’elu ihe ndina gị:
9 “‘Belteshaza, onyeisi nke ndị dibịa anwansi,+ ebe m maara nke ọma na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dị n’ime gị+ nakwa na ọ dịghị ihe nzuzo ọ bụla na-esiri gị ike,+ gwa m ọhụụ m hụrụ mgbe m na-arọ nrọ, kọọkwara m isi ha.+