47 Eze wee gwa Daniel, sị: “N’ezie, Chineke unu bụ Chi kasị chi niile+ na Onyenwe ndị eze+ na Onye na-ekpughe ihe nzuzo, ebe i nwere ike ikpughe ihe nzuzo a.”+
8 N’ikpeazụ, Daniel, onye aha ya bụ Belteshaza+ dị ka aha chi m si dị,+ onye mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dịkwa n’ime ya,+ batara n’ihu m; m wee kọọrọ ya nrọ ahụ, sị:
18 “‘Ọ bụ nke a bụ nrọ mụ onwe m bụ́ Eze Nebukadneza rọrọ; gị onwe gị, Belteshaza, kọọrọ m isi ya, ebe ọ bụ na ndị amamihe niile ọzọ nọ n’alaeze m enweghị ike ịkọrọ m isi ya.+ Ma i nwere ike ịkọ ya, n’ihi na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dị n’ime gị.’+