8 Kama ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ unu n’anya,+ nakwa na ọ na-edebe iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà,+ mere Jehova ji jiri aka dị ike kpọpụta unu,+ ka o wee napụta unu n’ụlọ ndị ohu,+ n’aka Fero eze Ijipt.
2 “Gaa jiri oké olu gwa Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Echetara m nke ọma obiọma* i nwere n’oge ị bụ nwa agbọghọ+ na ịhụnanya i nwere n’oge m kwere nkwa ịlụ gị,+ na otú i si na-eso m n’ala ịkpa, n’ala a na-aghaghị mkpụrụ ọ bụla.+