25 “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Mgbe m ga-akpọkọta ụlọ Izrel site n’etiti ndị dị iche iche bụ́ ebe a chụsasịrị ha,+ a ga-edokwa m nsọ n’etiti ha n’ihu mba dị iche iche.+ Ha ga-anọkwa n’ala ha+ nke m nyere ohu m Jekọb.+
21 “Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-akpọpụta ụmụ Izrel n’etiti mba dị iche iche ha gara. M ga-esikwa ebe niile kpọkọta ha wee kpọlata ha n’ala ha.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+