4 O wee chịrị ọlaedo ahụ ha chịtara ma jiri ihe e ji akpụ ihe kpụọ ya+ wee mee ka ọ ghọọ ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ.+ Ha wee malite ịsị: “Izrel, ihe a bụ Chi gị, nke dupụtara gị n’ala Ijipt.”+
4 O wee nyeghachi nne ya ọlaọcha ahụ, nne ya wee were narị mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe.+ O wee mee ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ;+ o wee dịrị n’ụlọ Maịka.
6 E nwere ndị na-awụfusị ọlaedo dị n’akpa, ndị na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ọlaọcha. Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, o wee jiri ya kpụọ chi.+ Ha na-adara ya n’ala, ee, ha na-akpọrọ ya isiala.+
4 Ha emewo ndị mmadụ eze,+ ma ọ bụghị site n’aka m. Ha emewo ndị mmadụ ndị isi, ma amaghị m banyere ya. Ha ejiriwo ọlaọcha ha na ọlaedo ha meere onwe ha arụsị,+ ka e wee bipụ ha.+
2 Ugbu a, ha na-emekwu mmehie, jirikwa ọlaọcha ha na-emere onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ arụsị dị iche iche,+ dị ka nghọta ha si dị, ha niile bụ aka ọrụ ndị omenkà.+ Ha na-agwa ha, sị, ‘Ka ụmụ mmadụ ndị na-achụ àjà susuo ụmụ ehi ọnụ.’+