4 “Ṅaanụ m ntị, unu ndị m; unu mba nke m,+ geenụ m ntị. N’ihi na iwu ga-esi n’ebe m nọ pụta,+ m ga-emekwa ka mkpebi ikpe m dịrị ka ìhè nye ndị dị iche iche.+
5 Ezi omume m dị nso.+ Nzọpụta m+ ga-apụta, ogwe aka m ga-ekpekwa ọbụna ndị dị iche iche ikpe.+ Agwaetiti niile ga-enwe olileanya n’ebe m nọ,+ ha ga-echerekwa ogwe aka m.+