10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
6 N’ihi na ị gbahapụwo ndị gị, bụ́ ụlọ Jekọb.+ N’ihi na ha jupụtara n’ihe si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ,+ ha na-emekwa anwansi+ dị ka ndị Filistia, ụmụ ala ọzọ jupụtakwara n’etiti ha.+
19 Ọ bụrụkwa na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ase+ ma ọ bụ ndị nwere mmụọ ịkọ ọdịnihu, bụ́ ndị na-ebe ubé,+ na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ọ́ bụghị Chi ha ka ndị ọ bụla kwesịrị ịjụ ase?+ È kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ?+
15 N’azụ obodo ka nkịta+ na ndị na-eme mgbaasị+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-egbu ọchụ na ndị na-ekpere arụsị na onye ọ bụla nke nwere mmasị n’ịgha ụgha, nke na-aghakwa ụgha,+ nọ.’