12 “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova rụchara ọrụ ya dum n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, m ga-eme ka eze Asiria zaa ajụjụ maka ihe obi nganga ya rụpụtara nakwa maka mpako nke anya ya dị elu.+
Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru banyere Idọm:+ “E nwere ozi anyị nụrụ nke si n’ebe Jehova nọ, e nwekwara onye ozi e zigara n’etiti mba dị iche iche, ‘Bilienụ, ka anyị biliekwa buso ya agha.’”+