10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike.+ M ga-enyere gị aka.+ M ga-eji aka nri m+ nke ezi omume+ jidesie gị ike.’
16 Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ, ọ ga-emekwa ka olu ya+ si na Jeruselem kwuo okwu. Eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ;+ ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba,+ ọ ga-abụkwara ụmụ Izrel ebe e wusiri ike.+
8 N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-abụ ihe nchebe gburugburu ndị bi na Jeruselem;+ onye ọ bụla n’ime ha nke na-ada ada ga-esi ike n’ụbọchị ahụ dị ka Devid,+ ụlọ Devid ga-adịkwa ike dị ka chi;+ dị ka mmụọ ozi Jehova nke na-ebutere ha ụzọ.+