6 Ndị m aghọwo ìgwè atụrụ na-ala n’iyi.+ Ndị na-azụ ha emewo ka ha na-awagharị.+ Ha eduruwo ha gaa n’elu ugwu.+ Ha esiwo n’otu ugwu gaa n’ugwu ọzọ. Ha echefuwo ebe izu ike ha.+
6 Atụrụ m wee na-akpafu n’ugwu ukwu niile nakwa n’ugwu ọ bụla dị elu;+ atụrụ m+ gbasasịkwara n’elu ala dum, n’enweghị onye ọ bụla na-ajụ ajụjụ ha, n’enweghịkwa onye ọ bụla na-achọ ha.
46 Pọl na Banabas wee kwuo okwu n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mkpa na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ebe ọ bụ na unu na-ajụ ya,+ ebe ọ bụkwa na unu na-ewere onwe unu ná ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, lee! anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+