17 “Ma mụ onwe m, lee, m ga-eweta iju mmiri+ n’elu ụwa iji bibie anụ ahụ́ niile ike ndụ+ na-arụ ọrụ n’ime ha n’okpuru eluigwe. Ihe ọ bụla dị n’ụwa ga-ekubi ume.+
19 N’ihi na ihe ndabara na-adabara ụmụ mmadụ, ihe ndabara na-adabakwara anụmanụ, otu ihe ndabara ahụ na-adabara ha.+ Dị ka anụmanụ na-anwụ, otú ahụ ka mmadụ na-anwụ;+ ha niile nwekwara naanị otu mmụọ ahụ,+ nke mere na ọ dịghị ihe mmadụ ji kara anụmanụ, n’ihi na ihe niile bụ ihe efu.
5 Nke a bụ ihe ezi Chineke, bụ́ Jehova, kwuru, bụ́ Onye kere eluigwe,+ Onye Ukwu nke setịrị ya;+ Onye gbasara ụwa+ na ihe niile dị n’ime ya,+ Onye na-enye ndị bi n’ime ya+ ume ha na-eku,+ na-enyekwa ndị na-ejegharị n’ime ya mmụọ:+
11 Mgbe ụbọchị atọ na ọkara ahụ gasịrị,+ mmụọ nke ndụ nke si n’ebe Chineke nọ banyere n’ime ha,+ ha wee guzo n’ụkwụ ha, oké egwu wee jide ndị na-ahụ ha.