13 Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka unu ga-emeso dị ka onye dị nsọ,+ ọ bụkwa ya ka unu ga na-atụ egwu,+ ọ bụ ya bụ Onye kwesịrị ime ka unu na-ama jijiji.”+
7 o ji oké olu na-asị: “Tụọnụ egwu Chineke,+ nyekwa ya otuto,+ n’ihi na oge awa nke ikpe si n’aka ya eruwo,+ n’ihi ya, feenụ Onye ahụ nke kere+ eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri niile.”+