23 Ka Chineke nke udo+ doo unu nsọ n’ụzọ zuru ezu.+ Ebe unu gbasiri ike n’ụzọ niile, ka mmụọ na mkpụrụ obi na ahụ́ unu bụ́ ụmụnna anyị bụrụ nke e chebere n’ụzọ na-enweghị ihe ịta ụta n’oge ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+
13 Otú ọ dị, anyị aghaghị ịdị na-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu, ụmụnna anyị ndị Jehova hụrụ n’anya, n’ihi na Chineke họọrọ unu+ site ná mmalite ka e wee zọpụta unu, site n’iji mmụọ nsọ+ doo unu nsọ,+ sitekwa n’okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ.+
22 Ebe unu meworo ka mkpụrụ obi unu dị ọcha+ site n’isi unu na-erubere eziokwu ahụ nke mere ka unu nwee ịhụnanya+ ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi unu.+