35 A ga-emekwa ka ụfọdụ n’ime ndị nwere nghọta daa,+ ka e wee rụọ ọrụ nnụcha n’ihi ha, meekwa ka ha dị ọcha ma mee ka ha na-enwu gbaa,+ ruo n’oge ikpeazụ;+ n’ihi na ọ ga-abụ n’oge a kara aka.+
9 M ga-etinye otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ n’ọkụ;+ m ga-anụcha ha dị ka e si anụcha ọlaọcha,+ nwaleekwa ha dị ka e si anwale ọlaedo.+ Ma, ha ga-akpọku aha m, m ga-azakwa ha.+ M ga-asị, ‘Ha bụ ndị m,’+ ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Jehova bụ Chineke anyị.’”+
7 ka okwukwe unu nke a nwalere anwale,+ nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya,+ wee bụrụ ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst.
12 Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-ere n’etiti unu, nke na-ere ịbụrụ unu ọnwụnwa,+ ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe a na-ahụtụbeghị na-adakwasị unu.