10 N’ihi na ọ bụrụ na, mgbe anyị bụ ndị iro,+ e mere ka anyị na Chineke dị ná mma site n’ọnwụ Ọkpara ya,+ a ga-azọpụta anyị ọbụna karị site ná ndụ ya, ebe e meworo ka anyị na ya dị ná mma.+
16 ka o wee meekwa ka ndị abụọ ahụ dị ná mma n’ụzọ zuru ezu+ n’otu ahụ́+ nye Chineke site n’osisi ịta ahụhụ,+ n’ihi na o jiriwo onwe ya mee ka ibu iro+ ahụ ghakwara ịdị.
20 na isi n’aka ya mee ka ya na ihe ndị ọzọ+ niile dị ná mma+ site n’iji ọbara+ ahụ ọ wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ+ mee udo,+ n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe ndị dị n’elu ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’eluigwe.