54“Tie mkpu ọṅụ, gị nwaanyị aga nke na-amụghị nwa!+ Nwee obi ụtọ, tiekwa mkpu ọṅụ, tisie mkpu ike,+ gị onye ime na-emeghị,+ n’ihi na ụmụ nke nwaanyị a gbahapụrụ agbahapụ dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwaanyị nwere di,”+ ka Jehova kwuru.
17 Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie, ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,+ ma ọ bụrụhaala na anyị na ya atakọọ ahụhụ+ ka e wee mee ka anyị na ya nwekọọ ebube.+