9 Ị ga-eke Erọn na ụmụ ya ndị ikom ákwà ike n’úkwù, ị ga-afụkwa ha ákwà ahụ a na-afụ n’isi; ọrụ nchụàjà ga-abụkwa nke ha dị ka ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka.+ Ị ga-enye Erọn ikike, nyekwa ụmụ ya ndị ikom.+
11 “Erọn ga-eweta oké ehi àjà mmehie ahụ, nke bụ́ maka onwe ya, wee kpuchiere onwe ya mmehie ya, kpuchiekwara ụlọ ya; ọ ga-egbukwa oké ehi àjà mmehie ahụ, nke bụ́ maka onwe ya.+
27 Ọ dịghị ya mkpa, dị ka ọ dị nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ịdị na-achụ àjà kwa ụbọchị,+ nke mbụ maka mmehie nke ya,+ mgbe ahụzi maka mmehie nke ndị ya:+ (n’ihi na nke a ka o mere naanị otu ugboro+ mgbe ọ chụrụ onwe ya n’àjà;)+
28 n’ihi na Iwu ahụ na-ahọpụta ndị ikom nwere adịghị ike+ ka ha bụrụ nnukwu ndị nchụàjà,+ ma ihe ahụ e ji ịṅụ iyi kwuo+ mgbe Iwu ahụ gasịrị họpụtara otu Ọkpara, bụ́ onye a na-eme ka o zuo okè+ ruo mgbe ebighị ebi.
7 ma ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’ime nkebi nke abụọ ahụ otu ugboro n’afọ,+ ọ naghị abanye ebe ahụ n’ejighị ọbara,+ bụ́ nke ọ na-eji achụ àjà maka onwe ya+ nakwa maka mmehie ndị Izrel mere n’amaghị ama.+